Ecclesiastes 11

Ịgbasapụ aka

1Gbasapụ aka gị nʼinye onyinye
nʼihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-anata ụgwọ ọrụ gị.
2Kee akụ gị ụzọ asaa maọbụ ụzọ asatọ
nʼihi na ị maghị ụdị ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị gị nʼobodo.

3Mgbe eluigwe rujiri,
mmiri ga-ezo;
mgbe osisi dara, maọbụ nʼugwu maọbụ na ndịda,
ebe ahụ ka ọ na-atọgbọ.
4Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla,
onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi.

5Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga
maọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime,
otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke,
onye mere ihe niile.

6Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ,
esepụkwala aka nʼanyasị,
nʼihi na ị maghị nke ga-eto,
maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ,
ha niile nwere ike too nke ọma.

Cheta Chineke nʼokorobịa gị

7Ìhè dị ụtọ,
ọ na-amasịkwa anya ịhụ ìhè anyanwụ.
8Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ,
ya ṅụrịa nʼime ihe niile,
ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrị
ga-adị ọtụtụ.
Ihe niile ndị na-abịa bụ ihe efu.

9Nwa okorobịa, ọ bụ ihe oke ọṅụ na ị bụ okorobịa.
Ya mere, ka obi gị nye gị ọṅụ nʼụbọchị niile nke okorobịa gị. a
Mee ihe niile ị chọrọ ime;
gbasookwa ihe niile nke anya gị na-ahụ.
Kama, ghọtakwa nke a,
na ị ghaghị ịza ajụjụ nʼihu Chineke nʼihi ihe niile i mere.
10Ya mere, wezuga nchegbu site nʼobi,
wezugakwa nsogbu nke ahụ gị,
nʼihi na okorobịa na ịdị ike bụ ihe efu.
Copyright information for IboBIU